Lotanna Alaemezie
Lotanna Alaemezie

@Lotannachikamso

4 Tweets 21 reads Aug 03, 2022
Agupe uzo, agupe onu. Chi tata efogo.
Ekene m Eze elu, Eze igwe, Eze udo, Amadioha gi bu Eze chukwu.
Kene Ala, Nne chukwu, Ogwugwu nwanyi okpu, Afo muru uwa.
Knee Idemili, Ezenwanyi mmiri
Kene Eze Agwu, Eze ikuku,
Kene Okeke Chim na Chi anyi niile
Kene Ndi mbu na Ndi egede, Ndi wee ana, Ndi ichie nwoke na Ndi ichie nwanyi (umu okpu)
Kene mmuo niile igbo ji biri, kene kwa aja ana Obodo niile no na ala igbo.
wee si na ahia tata bu Eke ga azu, zutara anyi ihe oma, ihe aku na ihe enwe enwe, ndu na ahu siri ike
Ihe anyi
Ga eri, ka anyi ga ahu, mana nke na eri anyi, gbate aka.
Amamihe, ako na uche, ogugu isi na ihe eji eneta ndu anya, ga abiara anyi tata.
Ofo na ogu ka anyi ji aga. Maka na oji ka idele ji awa ana.
Ndu nwoke, Ndu nwanyi
Onye iru ga adi, onye azu ga di.
Mana osisi furu
Tuba nkwe, ifife fegipu ya olu.
Na ihi na asi, Egbe bere ugo bere, nke si ibeya ebena, ya gosi ya ebe o ga ebe, ma obu nku ya kwaa.
Umu Igbo ,Udo na ndu tata.
Anyi si Ndi elu na Ndi ala, ha bia gozibe anyi Ubochi ndu anyi niile.
Isee.

Loading suggestions...